NKPUGHE 12:10-11
NKPUGHE 12:10-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼeluigwe na-ada sị, “O mezuola nʼikpeazụ, bụ nzọpụta Chineke na ike na alaeze Chineke anyị, na ikike ịchị isi Kraịst ya, ha abụrụla ihe dị ire. Nʼihi na e sitela nʼeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nʼihu Chineke. Ha lụgburu ya nʼagha site nʼọbara Nwa atụrụ ahụ na site nʼama nke okwu ọnụ ha, nʼihi na ha ahụghị ndụ ha nʼanya karịa, kama ha jikere inye ndụ ha ọbụladị ruo nʼọnwụ.
NKPUGHE 12:10-11 Bible Nso (IGBOB)
M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali. Ndi ahu we merie ya n'ihi ọbara Nwa-aturu ahu, na n'ihi okwu àmà-ha; ha ahughi kwa ndu-ha n'anya rue ọnwu.