NKPUGHE 1:4-6
NKPUGHE 1:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya, sitekwa nʼaka Jisọs Kraịst, onye bụ onyeama kwesiri ntụkwasị obi, na onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilie, nakwa onye na-achị ndị eze niile nke ụwa. Nye onye ahụ hụrụ anyị nʼanya ma meekwa ka anyị site nʼọbara ya nwere onwe anyị pụọ na mmehie. O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
NKPUGHE 1:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya; nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya; O we me ka ayi buru ala-eze, ndi-nchu-àjà nye Chineke na Nna nke Ya; ọ bu Ya ka otuto nile na ike nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.