ABÙ ỌMA 8:1-9
ABÙ ỌMA 8:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha? I mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri. O ONYENWE ANYị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
ABÙ ỌMA 8:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé. I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya? I we me ya ka ọ fọduru ya nke-ntà ibu Chineke, I ji kwa nsọpuru na ima-nma kpube ya n'isi dika okpu-eze. I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua: Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia; Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile. Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!