Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 8:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ ỌMA 8:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé. I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike, N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi, Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo; Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?

ABÙ ỌMA 8:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

O ONYENWE ANYị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. Site nʼotuto ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta ha?