ABÙ ỌMA 73:21-25
ABÙ ỌMA 73:21-25 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe m nọ nʼobi mwute; mmụọ m dara mba. Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị. Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; ị na-ejide m nʼaka nri m. Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 73ABÙ ỌMA 73:21-25 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na obim nāb͕ari uka, Ọ nādutukwam ogwu n'akurum abua. Ma mu onwem bu anu-ọhia, amaghkwam ihe; Nání anu ka m'buworo n'iru Gi. Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim. I gēji ndum-ọdu-Gi nēdum, Emesia I gēji kwa nsọpuru naram. Ọ̀nye k m'nwere n'elu-igwe ma-ọbughi Gi? Ma-ọbughi Gi ọ dighi onye ihe-ya tọworom utọ n'uwa.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 73