Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 69:14-18 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ABÙ ỌMA 69:14-18 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Dọpụta m site nʼụrụrọ, ekwela ka m mikpuo; zọpụta m site nʼaka ndị kpọrọ m asị, site na mmiri miri emi. Ekwela ka uju mmiri kpuchie m, maọbụ ka ebe dị omimi loda m, ma ọ bụkwanụ ka olulu lomie m, kpuchie m nʼime ọnụ ya. O ONYENWE ANYị, zaa m, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, nʼime ịdị ukwuu nke oke ebere gị, chee m ihu. Ezonarịla mụ bụ ohu gị ihu gị. Anọ m na nsogbu, mee ngwangwa zaa m! Bịa m nso zọpụta m. Gbapụta m site nʼaka ndị iro m.

ABÙ ỌMA 69:14-18 IGBOB (Bible Nso)

Naputam n'apiti, ekwe-kwa-la ka m'mikpùe. Kwe ka anaputam n'aka ndi nākpọm asì, ka anaputakwam na miri nke miri emi. Ekwela ka miri nke nērù ọku ọku ṅachapum, Ekwe-kwa-la ka ebe di omimi lodam; Ekwe-kwa-la ka olùlù kpuchibidom ọnu-ya. Zam, Jehova; n'ihi na ebere-Gi di nma: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di chem iru. Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi; N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam. Biarue nkpuru-obim nso, b͕aputa ya: N'ihi ndi-irom b͕aputam.