ABÙ ỌMA 61:1-2 - Compare All Versions
ABÙ ỌMA 61:1-2 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nụrụ akwa m, O Chineke, gee ntị nʼekpere m. Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu.
Kesaa
ABÙ ỌMA 61 BIUABÙ ỌMA 61:1-2 IGBOB (Bible Nso)
Chineke, nuru olu iti-nkpum; Ṅa nti ekperem. M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike: Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.
Kesaa
ABÙ ỌMA 61 IGBOB