ABÙ ỌMA 56:8-11
ABÙ ỌMA 56:8-11 Bible Nso (IGBOB)
Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi: Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim. Nime Chineke ka m'gēto okwu-Ya: Nime Jehova ka m'gēto okwu-Ya. Ọ bu Chineke ka m'tukwasiworo obi, m'gaghi-atu egwu; Gini ka anu-aru, bú madu, gēmem?
ABÙ ỌMA 56:8-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Depụta akwa arịrị m; chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị? Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, ndị iro m ga-agbaghachi azụ. Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m. Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, nʼime ONYENWE ANYị, onye m na-eto okwu ya, nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?