ABÙ ỌMA 53:1-3
ABÙ ỌMA 53:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye nzuzu na-asị nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ụzọ ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. Chineke sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya, ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta, onye nke na-achọ Chineke. Onye ọbụla, nʼotu nʼotu ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị otu onye.
ABÙ ỌMA 53:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka ajọ omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe. Chineke siri n'elu-igwe lekwasi umu madu anya, Ihu ma ọ di onye nwere uche, Nke nāchọ Chineke. Ha nile n'otù n'otù alaghachiwo azu; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.