ABÙ ỌMA 51:9-13 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 51:9-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị.
Kesaa
ABÙ ỌMA 51 BIUABÙ ỌMA 51:9-13 IGBOB (Bible Nso)
Zopu iru-Gi na nmehiem nile, Hichapu kwa ajọ omumem nile. Kèrem obi di ọcha, Chineke; Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem. Atupulam n'iru Gi; Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi. Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi: Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem. M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile; Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.
Kesaa
ABÙ ỌMA 51 IGBOB