ABÙ ỌMA 44:1-26
ABÙ ỌMA 44:1-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga. I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị. Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri; ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị. Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ. I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị. Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile. I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị. I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu. I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị. Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu, mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ. Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị. Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị. Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị. Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị, ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi? Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu. O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra? Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị, ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị? E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu, ahụ anyị rapara nʼaja Bilie ma nyere anyị aka; gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.
ABÙ ỌMA 44:1-26 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie. Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka. N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu, Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha: Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi, N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ. Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke: Nye nzọputa nile nke Jekob iwu. Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi: Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu. N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi, Mma-agham adighi-azọputakwam. Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi, I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì. Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere; I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha. I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu: Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha. I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri; N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi. I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia, I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta, Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò. I nēme ayi ilu n'etiti mba nile, Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche. Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum, Ihere irum ekpuchiwokwam, N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu; N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀. Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi, Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi Obi-ayi alaghachighi azu, Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha; Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia, Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi. Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi, We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi; Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a? N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi. N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile; Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u. Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi? Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi. N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi? N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi? N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá: Afọ-ayi araparawo n'ala. Bilie iyere ayi aka, B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.