ABÙ ỌMA 41:7-10
ABÙ ỌMA 41:7-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị niile kpọrọ m asị na-agbarịta izu megide m; ha na-echekwa echiche ọjọọ banyere m, na-asịrịta onwe ha: “Ọrịa ọjọọ adakwasịla ya; ọ gaghị esite na ihe ndina ya bilie ọtọ ọzọ.” Ọ bụladị ezigbo enyi m, onye m tụkwasịrị obi, onye mụ na ya na-eso erikọ nri m, ebiliela imegide m. Ma gị, O ONYENWE ANYị, meere m ebere, mee ka ahụ sie m ike ọzọ, ka m nwee ike kwụghachi ha ụgwọ.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 41ABÙ ỌMA 41:7-10 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nile nke nākpọm asì nātakwurita ntakwu imegidem: N'imegidem ka ha nēchèrem ihe ọjọ. Anāwukwasi ya ihe jọb͕uru onwe-ya, ka ha kwuru: E, nke o dinaworo ub͕u a ọ gaghi-ebili ọzọ. Ọbuná nwoke nke mu na ya di n'udo, onye m'tukwasiri obi, onye nēri nrim, Ọ mewo ikiri-ukwu-ya ka ọ di uku imegidem. Ma Gi onwe-gi, Jehova, merem amara, me ka m'bilie, Ka m'we kwughachi ha ugwọ.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 41