ABÙ ỌMA 40:6-8
ABÙ ỌMA 40:6-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ ma ị megheela ntị abụọ; aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, iwu gị dị nʼime obi m.”
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 40ABÙ ỌMA 40:6-8 Bible Nso (IGBOB)
Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ; Nti abua ka I ràpúworom: Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo. Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom; N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem: Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 40