ABÙ ỌMA 37:23-25 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 37:23-25 IGBOB (Bible Nso)
Site n'aka Jehova ka emeworo ka nzọ-ukwu nile nke madu guzosie ike; Uzọ-ya nātọ kwa Ya utọ. Mb͕e ọ gada, agaghi-atudasi ya: N'ihi na Jehova nākwagide aka-ya. Nwata ka m'buworo, aghọwokwam okenye; Ma ahughm onye ezi omume ka arapuru ya, Ahughkwam nkpuru-ya ka ha nāriọ nri.
Kesaa
ABÙ ỌMA 37 IGBOBABÙ ỌMA 37:23-25 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ONYENWE ANYị nwere mmasị na ndụ mmadụ, ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada, nʼihi na ONYENWE ANYị na-eji aka ya ejigide ya. Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Kesaa
ABÙ ỌMA 37 BIU