ABÙ ỌMA 36:1-4
ABÙ ỌMA 36:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha. Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi.
ABÙ ỌMA 36:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ihe nke nāputa n'ọnu njehie nke onye nēmebi iwu nāsi n'etiti obim Ọ dighi oké egwu Chineke di n'anya-ya abua. N'ihi na ọ nāgwa onwe-ya okwu ire-utọ n'anya onwe-ya, Bayere ichọputa ajọ omume-ya na ikpọ ya asì. Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma. Ajọ ihe ka ọ nēchè n'elu ihe-ndina-ya; Ọ nēguzo onwe-ya n'uzọ nke nādighi nma; Ọ dighi-aju ihe ọjọ.