ABÙ ỌMA 32:1-5
ABÙ ỌMA 32:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye ONYENWE ANYị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. Sela Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu ONYENWE ANYị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
ABÙ ỌMA 32:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya. Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume, Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya. Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nká Site n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile. N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum: Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem: M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile; Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah