ABÙ ỌMA 22:8-11 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 22:8-11 IGBOB (Bible Nso)
Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ. Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa: Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka.
ABÙ ỌMA 22:8-11 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“O na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi; ka ONYENWE ANYị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.” Ma ONYENWE ANYị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.