ABÙ ỌMA 22:19-24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 22:19-24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma gị, ONYENWE ANYị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a. Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. Toonu ONYENWE ANYị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel! Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
ABÙ ỌMA 22:19-24 IGBOB (Bible Nso)
Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka. Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita. Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom. Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi. Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya; Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya; Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya.