ABÙ ỌMA 22:1-31
ABÙ ỌMA 22:1-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere. Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel. Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha. Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi. Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. “O na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi; ka ONYENWE ANYị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.” Ma ONYENWE ANYị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara. Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m. Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso. Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu. Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m. A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m. Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ. Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m. A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m. Ma gị, ONYENWE ANYị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka. Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa. Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a. Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto. Toonu ONYENWE ANYị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel! Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya. Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị. Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ ONYENWE ANYị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute ONYENWE ANYị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya. Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke ONYENWE ANYị, ọ na-achịkwa mba niile. Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ. Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị. Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
ABÙ ỌMA 22:1-31 Bible Nso (IGBOB)
Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya? Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere. Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi: Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha: Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya. Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi: Ha na-enu ọnu, fufè isi, si, Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ. Otú ọ di, Gi onwe-gi bu onye meworo ka m'waputa n'afọ nnem: I nēme ka m'tukwasi obi mb͕e m'nọ nara nnem. Na Gi ka atukwasirim site n'àkpà-nwa: Site n'afọ nnem ka Gi onwe-gi bu Chinekem. Anọlam n'ebe dí anya; n'ihi na nkpab͕u di nso; N'ihi na ọ dighi onye nēyerem aka. Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu. Ha asaghepuwo ọnu-ha n'arum, Dika ọdum nke nādọb͕u anu, nke nāb͕ọ kwa uja. Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm. Ikem akpọwo nku di ka osisi; Irem nārapara kwa n'ab͕am; Ọ bu kwa n'ájá ọnwu ka I nātọb͕ọm. N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua. Anamagu ọkpukpum nile ọnu; Ndi ahu nēlegide nēlekwam anya: Ha nēkère onwe-ha uwem, N'elu ihe m'nēyi n'aru ka ha nēfe kwa nzà. Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka. Naputa nkpuru-obim na mma-agha; Naputa nkpuru-obi m'nwere nání ya náka nkita. Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom. Agamakọrọ umu-nnem aha-Gi: N'etiti nkpọkọta-Gi ka m'gēto Gi. Ndi nātu egwu Jehova, tonu Ya; Unu nile, bú nkpuru nke Jekob, sọpurunu Ya; Tu-kwa-nu ujọ Ya, unu nkpuru nile nke Israel. N'ihi na O ledaghi nweda-n'ala nke onye ewedara n'ala anya, Ọ kpọghi kwa ya ihe-árú; O zonarighi kwa ya iru-Ya; Ma mb͕e o tikuru Ya, Ọ nuru olu-ya. N'ebe I nọ ka otutom si bia nime nkpọkọta-Gi bara uba: M'gākwughachi nkwam nile n'iru ndi nātu egwu Ya. Ndi di ume-ala n'obi gēri ihe, riju kwa afọ: Ha gēto Jehova, bú ndi nāchọ Ya: Ka obi-unu di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi. N'ihi na ọ bu Jehova nwe ala-eze: Ọ nāchi kwa mba nile. Ndi bara uba nile nke uwa gēri ihe, kpọ kwa isi ala: N'iru Ya ka ndi nile ndi nārida n'ájá gēruru ala, Ha na onye nēdebeghi nkpuru-obi-ya ndu. Otù nkpuru gēfè Ya òfùfè; Agākọrọ ọb͕ọ ọzọ akukọ a bayere Onye-nwe-ayi. Ha gābia gosi otù ndi agàmuputa n'iru ezi omume-Ya, Na O mewo ya.