ABÙ ỌMA 150:1-6
ABÙ ỌMA 150:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị. Toonu Chineke nʼime ụlọnsọ ya. Toonu ya, na mbara igwe nke ike ya. Toonu ya, nʼihi ọrụ niile ọ rụrụ site nʼike ya. Toonu ya, nʼihi ịdị ukwuu ya nke kachasị ịdị ukwuu niile. Werenụ opi ike too ya, werekwanụ ụbọ akwara na une too ya, jirinụ ihe iti egwu na ite egwu too ya, jirikwanụ ụbọ akwara dị iche iche na ọja too ya, werenụ ogene too ya, werekwanụ ogene na-ada oke ụda too ya. Ka ihe niile na-eku ume too ONYENWE ANYị.
ABÙ ỌMA 150:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja. Tonu Chineke n'ebe nsọ Ya: Tonu Ya na mbara-ígwé nke ike-Ya. Tonu Ya n'ihi idi-ike-Ya nile: Tonu Ya dika iba-uba nke idi-uku-Ya si di. Werenu ọfufù opì-ike to Ya: Chirinu une na ubọ-akwara to Ya. Werenu egwú-otiti na ite-egwú to Ya: Chirinu ubọ eji akwara kwe na ọ̀jà to Ya: Chirinu ájà nke anānu nke-ọma to Ya: Chirinu ájà nke nādasi udà ike to Ya. Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja. Tonu Ja.