ABÙ ỌMA 147:7-11
ABÙ ỌMA 147:7-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jirinụ ekele bụkuo ONYENWE ANYị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu. Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile. Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. ONYENWE ANYị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
ABÙ ỌMA 147:7-11 Bible Nso (IGBOB)
Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma: Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe, Onye nēdoziri ala miri-ozuzo, Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia. Ọ nēnye anumanu nri-ya, Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya. Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ: Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ. Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere-Ya.