ABÙ ỌMA 147:12-20
ABÙ ỌMA 147:12-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O Jerusalem, jaa ONYENWE ANYị mma; o Zayọn, too Chineke gị. Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike, na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo, jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa. Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ, na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ. Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute. Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya? Ọ na-ezipụ okwu ya na-agbaze ha; ọ na-akpalịte ikuku ya mee ka mmiri bido ịsọgharị. O kpugheela okwu ya nye Jekọb, iwu ya na ụkpụrụ ya niile nye Izrel. O mesobeghị mba ọzọ ụdị mmeso dị otu a. Ha amakwaghị iwu ya niile.
ABÙ ỌMA 147:12-20 Bible Nso (IGBOB)
Gi Jerusalem, nāja Jehova; To Chineke-gi, Zaion. N'ihi na O mewo ka ihe-ntuchi nile nke ọnu-uzọ-ama-gi nile di ike; Ọ gọziwo umu-gi n'etiti gi. Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ. Ọ bu onye nēzisa okwu-ọnu-Ya n'uwa; Ngwa ngwa ka okwu-Ya nāb͕a ọsọ. Ọ bu onye nēnye snow dika aji-anu; Ọ nēfesa hoar-frost dika ntu. Ọ nātupu ice-Ya dika iberibe achicha: Ònye gēguzo n'iru oyi-Ya? Ọ nēzipu okwu-Ya, we b͕aze ha: Ọ nēme ka ifufe-Ya fe, miri we rùe. Ọ nēgosi Jekob okwu-Ya, Nēgosi kwa Israel ukpuru-Ya nile na ikpé-Ya nile. O mesoghi mba ọ bula otú a: Ma ikpé-Ya nile, ha amaghi ha. Tonu Ja.