ABÙ ỌMA 147:1-11
ABÙ ỌMA 147:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị! Ọ bụ ihe dị mma ịbụku Chineke anyị abụ otuto. Ọ bụ ihe na-eweta mmasị, bụrụkwa ihe ziri ezi ito ya! ONYENWE ANYị na-ewu Jerusalem: ọ na-akpọghachita ụmụ Izrel ndị a dọọrọ nʼagha gaa nʼala ọzọ. Ọ na-agwọ ndị niile obi ha tiwara etiwa na-ekechikọtakwa ebe niile ha merụrụ ahụ. Ọ bụ ya na-ekpebi ọnụọgụgụ kpakpando niile na-akpọkwa ha nʼotu na otu. Onyenwe anyị dị ukwuu, ike ya dịkwa ukwuu; nghọta ya enweghị nsọtụ. ONYENWE ANYị na-agba ndị dị umeala nʼobi ume ma ọ na-atụda ndị ajọ omume nʼala. Jirinụ ekele bụkuo ONYENWE ANYị abụ; jirinụ ụbọ akwara kpọọrọ Chineke anyị egwu. Ọ na-eji igwe ojii na-ekpuchi mbara eluigwe; ọ na-ewetara elu ụwa mmiri ozuzo na-eme ka ahịhịa puo nʼelu ugwu niile. Ọ na-enye ehi niile nri na-enyekwa ụmụ ugolọma nri mgbe ha na-ebeku ya akwa nʼihi nri. Mmasị ya adịghị nʼike nke ịnyịnya, maọbụ nʼike ụkwụ nke mmadụ. ONYENWE ANYị na-enwe mmasị nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ, ndị olileanya ha dị na ịhụnanya ya nke na-adịghị agharịpụ.
ABÙ ỌMA 147:1-11 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja; N'ihi na ọ di nma ibùku Chineke-ayi abù ọma; N'ihi na ọ di utọ, otuto mara nma. Jehova nēwuli Jerausalem elu; Ndi adọtara n'agha nke Israel ka Ọ nāchikọta. Ọ bu onye nēme ka ndi obi-ha tiwara etiwa diri ndu, Ọ nēkechi kwa ihe-nb͕u nile ha. Ọ nāguta ọnu-ogugu kpakpando; Ha nile ka Ọ nākpọ aha. Onye uku ka Onye-nwe-ayi bu, O nwe-kwa-ra ike riri nne; Nghọta-Ya enweghi ọnu-ọgugu. Jehova nēme ka ndi di ume-ala n'obi guzo ọtọ: Ọ nēme ka ndi nēmebi iwu di ala ọbuná rue ala. Werenu ekele za Jehova, Werenu ubọ-akwara bùkue Chineke-ayi abù ọma: Onye ji igwe-oji ekpuchi elu-igwe, Onye nēdoziri ala miri-ozuzo, Onye nēme ka ugwu nile pue ahihia. Ọ nēnye anumanu nri-ya, Nēnye kwa umu-ugolo-ọma nke nākpọlu Ya. Ọ bughi idi-ike nke inyinya nātọ Ya utọ: Ọ bughi ogwe-ukwu abua nke nwoke nādi Ya utọ. Ihe nātọ Jehova utọ bu ndi nātu egwu Ya, Ndi nēchere ebere-Ya.