ABÙ ỌMA 145:13-16
ABÙ ỌMA 145:13-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. ONYENWE ANYị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. ONYENWE ANYị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba. Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru. I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 145ABÙ ỌMA 145:13-16 Bible Nso (IGBOB)
Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile. Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala. Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 145