ABÙ ỌMA 140:1-13
ABÙ ỌMA 140:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche. Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha na-akpali agha ụbọchị niile. Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha. Sela Chebe m ONYENWE ANYị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, ndị na-eche echiche ọdịda m. Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. Sela A sịrị m ONYENWE ANYị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” Nụrụ, O ONYENWE ANYị, olu arịrịọ m maka amara. Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị Onye nzọpụta m dị ike, ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha. Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o ONYENWE ANYị, ekwekwala ka nzube ha mezuo. Sela Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. Amaara m na ONYENWE ANYị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha. Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.
ABÙ ỌMA 140:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ; Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche: Ndi chèworo ihe ọjọ di iche iche n'obi-ha; Ubọchi nile ọ bula ka ha nēzukọ ibu agha di iche iche. Ha amuwo ire-ha dika agwọ; Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha. Selah Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu; Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike: Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile. Ndi-npako ezobeworom ib͕udu, na udọ̀ di iche iche; Ha ab͕asowo ub͕u n'akuku uzọ; Ọnyà di iche iche ka ha siworom. Selah Asirim Jehova, Chinekem ka I bu: Ṅa nti olu aririọ-amaram nile, Jehova. Jehova, Onye-nwe-ayi, ike nke nzọputam, I kpuchiwo isim n'ubọchi ihe-agha nile. Jehova, enyela ihe onye nēmebi iwu nāchọsi ike; Emela ka nzube ọjọ ya gara ya; ha nēbuli onwe-ha elu. Selah Ma isi ndi nọm buruburu, Ka nmeb͕u nke eb͕ub͕ere-ọnu-ha kpuchie ha. Ka ha me ka icheku-ọku me nkpatu imegide ha: Ya me ka ha dabà n'ọku; N'ob͕u-miri, ka ha we ghara ibili ọzọ. Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa: Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya. Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye. N'ezie ndi ezi omume gēkele aha-Gi: Ndi ziri ezi gēbi n'iru Gi.