ABÙ ỌMA 139:1-8
ABÙ ỌMA 139:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya. Òle ebe m'gālanari Mọ-Gi? Ma-ọbu òle ebe m'gēsi n'iru Gi b͕alaga? Ọ buru na arigom n'elu-igwe, n'ebe ahu ka I nọ: Ọ buru kwa na ab͕asam utem n'ala-mọ, le, I nọ n'ebe ahu.
ABÙ ỌMA 139:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. O ONYENWE ANYị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya. Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị. Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya. Ebee ka m ga-ezo onwe m si otu a zonarị Mmụọ gị? Ebeekwa ka m pụrụ ịgbaga ka m si nʼihu gị zoo onwe m? Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ.