ABÙ ỌMA 138:1-8 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 138:1-8 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O ONYENWE ANYị, aga m eji obi m niile too gị; nʼihu chi niile dị iche iche ka m ga-abụku gị abụ otuto. Aga m akpọ isiala nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị aga m etokwa aha gị nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼihi na i meela ka aha gị na okwu gị dị elu karịa ihe niile. Mgbe m kpọkuru gị, ị zara m; i mere m ka m nwee nkwuwa okwu ma guzosiekwa ike. O ONYENWE ANYị, ka ndị eze niile nọ nʼụwa too gị, mgbe ha nụrụ ihe niile i nyere nʼiwu. Ka ha bụọ abụ banyere ụzọ niile nke ONYENWE ANYị, nʼihi na ebube ONYENWE ANYị dị ukwuu. Nʼagbanyeghị na ONYENWE ANYị dị ukwuu, ọ na-elekwasị ndị dị umeala nʼobi anya, ma ọ naghị ekwe ka ndị nganga bịa ya nso. A sịkwarị na m na-eje ije nʼetiti nsogbu, ị na-echebe ndụ m; ị na-esetipụ aka gị megide iwe ndị kpọrọ m asị, ị na-eji aka nri gị zọpụta m. ONYENWE ANYị ga-emezuru m ihe niile o kwadoro m; ịhụnanya gị, o ONYENWE ANYị, na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ahapụkwala ọrụ aka gị niile.
ABÙ ỌMA 138:1-8 IGBOB (Bible Nso)
M'gēji obim nile kele Gi: N'iru chi nile ka m'agābùku Gi abù ọma. M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di, M'gēkele kwa aha-Gi n'ihi ebere-Gi na n'ihi ezi-okwu-Gi: N'ihi na I mewo ka okwu-ọnu-Gi di uku n'elu aha-Gi nile. N'ubọchi m'kpọkuru Gi ka I zaram, I nēji ike di na nkpuru-obim kpaliem. Eze nile nke uwa gēkeli Gi, Jehova, N'ihi na ha anuwo okwu nile nke ọnu-Gi. Ha gābù kwa abù bayere uzọ nile nke Jehova; N'ihi na ebube Jehova di uku. N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya. Ọ buru na ejeghariam n'etiti ahuhu, I gēme ka m'di ndu; I gēseti aka-Gi imegide iwe ndi-irom, Aka-nri-Gi gāzọputakwam. Jehova gēmezurum ihe nile: Jehova, ebere-Gi nādiru mb͕e ebighi-ebi; Arala aka n'ọlu nile nke aka-gi abua.