ABÙ ỌMA 130:1-8
ABÙ ỌMA 130:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. Onyenwe anyị, nụrụ olu m. Ka ntị gị na-aṅakwa ntị nʼolu arịrịọ m, maka amara. O ONYENWE ANYị, a sị na i detuo mmehie niile, Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie dị; ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. Ana m echere ONYENWE ANYị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na ONYENWE ANYị, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel site na mmehie ya niile.
ABÙ ỌMA 130:1-8 Bible Nso (IGBOB)
N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova. Onye-nwem, ge nti olum: Ka nti-Gi nāṅa kwa nti N'olu nke aririọ-amaram nile. Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja, Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo? Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di, Ka ewe tua egwu Gi. Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya, Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo. Nkpuru-obim nēchere Jehova, Karia ka ndi-nche si echere ututu; E, karia ka ndi-nche si echere ututu. Israel, chere Jehova: N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di, Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya. Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa Israel N'ajọ omume-ya nile.