ABÙ ỌMA 128:1-6
ABÙ ỌMA 128:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị, ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv gburugburu tebul gị. Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ na-atụ egwu ONYENWE ANYị. Ka ONYENWE ANYị gọzie gị site na Zayọn ụbọchị niile nke ndụ gị; ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. Ka udo dịrị Izrel.
ABÙ ỌMA 128:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu, Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile. N'ihi na ihe i chiri ọbu-aka-gi dọb͕u onwe-gi n'ọlu inwe ka i gēri: Onye ihe nāgara nke-ọma ka i bu, ọ gādi-kwa-ra gi nma. Nwunye-gi gādi ka osisi vine nāmi nkpuru n'ime-ime-ulo nke ulo-gi: Umu-gi gādi ka ome osisi oluve buruburu table-gi. Le, na otú a ka agāgọzi nwoke ahu Nke nātu egwu Jehova. Jehova gēsi na Zaion gọzie gi: Gi lekwasi kwa ọdi-nma Jerusalem anya ubọchi nile nke ndu-gi, Hu kwa umu nke umu-gi gāmu. Ka udo dikwasi Israel.