ABÙ ỌMA 125:1-5
ABÙ ỌMA 125:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị niile na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi. Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, otu a ka ONYENWE ANYị na-agba ndị ya gburugburu ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, nʼihi na ndị ezi omume nwere ike itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ. O ONYENWE ANYị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi. Ma ONYENWE ANYị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ na ndị niile na-eme ajọ ihe.
ABÙ ỌMA 125:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nātukwasi Jehova obi Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide. Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu: Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu. Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà; Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume. Jehova, me ndi di nma nma, Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma. Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.