ABÙ ỌMA 119:56-62 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 119:56-62 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. O ONYENWE ANYị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị. Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi. A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị. Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
ABÙ ỌMA 119:56-62 IGBOB (Bible Nso)
Nka ka m'nweworo, Na echebewom ihe-iriba-ama-Gi nile. Òkèm ka Jehova bu: Asiwom na m'gēdebe okwu-Gi nile. Ewerewom obim nile me ka iru-Gi dajua: Merem amara dika okwu-ọnu-Gi si di. Echèrem èchìchè uzọm nile, We me ka ukwum abua laghachi n'ihe-àmà-Gi nile. Abiaram ọsọsọ, ọ b͕agwojughkwam anya, Idebe ihe nile I nyere n'iwu. Udọ̀ nile nke ndi nēmebi iwu ehikọwom buruburu; Ma echezọghm iwu-Gi. N'etiti abali ka m'gēbili ikele Gi N'ihi ikpé nile nke ezi omume-gi.