ABÙ ỌMA 11:1-7
ABÙ ỌMA 11:1-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼime ONYENWE ANYị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? ONYENWE ANYị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; ONYENWE ANYị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe. Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. ONYENWE ANYị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha. Nʼihi na ONYENWE ANYị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
ABÙ ỌMA 11:1-7 Bible Nso (IGBOB)
Na Jehova ka m'b͕abàworo: Ùnu si aṅa si nkpuru-obim, Felaganu n'ugwu-unu dika nnunu? N'ihi na, le, ndi nēmebi iwu nāzọ uta-ha ukwu ikwe ya, Ha edoziwo àkù-ha n'elu eriri-uta, Ib͕a ndi obi-ha ziri ezi n'ochichiri. N'ihi na anākwada ide nile; Gini ka onye ezi omume meworo? Jehova nọ n'ulo uku Ya di nsọ, Jehova, n'elu-igwe ka oche-eze-Ya di; Anya-Ya nāhu, mbubere-anya-Ya nānwa, umu madu. Jehova n'anwa onye ezi omume: Ma onye nēmebi iwu na onye nāhu ihe-ike n'anya ka nkpuru-obi-Ya nākpọ asì. Ya me ka ib͕udu zokwasi ndi nēmebi iwu dika miri-ozuzo; Ka ọku na brimstone na ifufe di ọku buru òkè ìko-ha. N'ihi na onye ezi omume ka Jehova bu; ezi omume ka Ọ huru n'anya: Ndi ziri ezi gāhu iru-ya.