ABÙ ỌMA 107:4-9
ABÙ ỌMA 107:4-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi. Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile. O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ.
ABÙ ỌMA 107:4-9 Bible Nso (IGBOB)
Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu, Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe.