ABÙ ỌMA 107:10-16
ABÙ ỌMA 107:10-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile. O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ.
ABÙ ỌMA 107:10-16 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè; N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu: O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta, Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè.