ABÙ ỌMA 107:1-3
ABÙ ỌMA 107:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Keleenụ ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ka ndị niile ONYENWE ANYị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị, ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 107ABÙ ỌMA 107:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u; O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha, Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu, Site n'Ugwu na site n'oké osimiri.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 107