ABÙ ỌMA 103:3-5 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 103:3-5 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọ bụ ya na-agbaghara gị mmehie gị niile; na-agwọkwa gị ọrịa gị niile, onye na-agbapụta ndụ gị site nʼolulu werekwa ịhụnanya na ọmịiko kpukwasị gị dịka okpueze, onye na-eji ezi ihe na-emejupụta ọchịchọ gị niile, ka oge okorobịa gị bụrụ ihe a gbanwere dịka nke ugo.
Kesaa
ABÙ ỌMA 103 BIUABÙ ỌMA 103:3-5 IGBOB (Bible Nso)
Bú Onye nāb͕aghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile; Onye nāb͕aputa ndu-gi n'aka nbibi; Onye nēkpube gi okpu-eze, bú ebere na obi-ebere di iche iche: Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi; Idi-na-nwata-gi ewe me onwe-ya ka ọ di ọhu dika ugo.
Kesaa
ABÙ ỌMA 103 IGBOB