ABÙ ỌMA 103:10-12 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ABÙ ỌMA 103:10-12 IGBOB (Bible Nso)
Ọ bughi dika nmehie nile ayi si di ka O meworo ayi, Ọ bughi kwa dika ajọ omume nile ayi si di ka O mesoworo ayi. N'ihi na dika idi-elu nke elu-igwe si di n'elu uwa, Otú a ka ebere-Ya di ike n'aru ndi nātu egwu Ya. Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.
Kesaa
ABÙ ỌMA 103 IGBOBABÙ ỌMA 103:10-12 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
ọ bụghị dịka mmehie anyị si dị ka ọ na-emeso anyị, ọ dịghị akwụghachi anyị dịka ajọ omume anyị si dị. Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ. Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
Kesaa
ABÙ ỌMA 103 BIU