ABÙ ỌMA 10:12-18
ABÙ ỌMA 10:12-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Bilie O ONYENWE ANYị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta. ONYENWE ANYị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. O ONYENWE ANYị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.
ABÙ ỌMA 10:12-18 Bible Nso (IGBOB)
Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu: Echezọla ndi ewedara n'ala. N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke? Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju. I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo. Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya. Jehova bu Eze rue mb͕e nile ebighi-ebi: Mba nile ọzọ esiwo n'ala-Ya lapu n'iyì. I nuwo ihe ndi di ume-ala n'obi nāchọsi ike, Jehova: I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge: Ikpe nwa-nb͕ei na onye anāzọpia azọpia ikpe, Ka madu nke sitere n'uwa we ghara ime ka madu ma kwa jijiji ọzọ.