ABÙ ỌMA 1:3-6
ABÙ ỌMA 1:3-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. Ha dị ka igbugbo ọka nke oke ifufe na-efesasị. Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume. Nʼihi na ONYENWE ANYị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
ABÙ ỌMA 1:3-6 Bible Nso (IGBOB)
Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma. Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa. N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé, Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume. N'ihi na Jehova mara uzọ ndi ezi omume: Ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n'iyì.