Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 9:9-12 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ILU 9:9-12 IGBOB (Bible Nso)

Nye onye mara ihe nmuta, ọ gāmara kwa ihe kari: Me ka onye ezi omume mara ihe, ọ gātukwasi ihe-nmuta n'amam-ihe-ya. Nmalite amam-ihe ka egwu Jehova bu: Ihe-ọmuma nke Onye Nsọ bu kwa nghọta. N'ihi na site na mu ka ubọchi-gi gāba uba, Agātukwasi-kwa-ra gi arọ ndu. Ọ buru na i mara ihe, i maworo onwe-gi ihe: Ọ buru kwa na i kwa emò, nání gi gēbu ya.

ILU 9:9-12 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa, kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. Nʼihi na ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo. A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị. Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru, ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.