ILU 8:4-36
ILU 8:4-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu. Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta. Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi, Ọnụ m na-ekwu eziokwu nʼihi na akpọrọ m okwu ụgha asị. Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya. Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi. Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.” Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya. “Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị. Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike. Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi. Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa. Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m. Ana m ekenye ụba na nsọpụrụ, na ikpe ziri ezi na ezi omume. Onyinye m na-enye dị mma karịa ọlaọcha, ọ karịkwara ọlaedo. Ana m aga ije nʼụzọ ezi omume, nʼokporoụzọ ikpe ziri ezi. Ndị niile hụrụ m nʼanya, na-eketa akụnụba. Ana m emejupụtakwa ụlọakụ ha. “ONYENWE ANYị kpụrụ m dịka mmalite ụzọ ya, tupu o bido ike ihe ọbụla ọzọ. Site nʼebighị ebi gara aga ka m dị; adịkwa m adị tupu e kee ụwa. Anọ m na-adị tupu e kee ogbu mmiri, tupu isi iyi ọbụla agbapụta mmiri nʼelu ụwa, tupu e kee ugwu ukwu na ugwu nta. E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya, mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị, ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya, mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka. Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ; ana m egwuri egwu nʼihu ya. Ihe niile o kere tọkwara m ụtọ, ụwa niile na ụmụ mmadụ! “Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị; nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe, agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ; ọ natakwala ihuọma nʼebe ONYENWE ANYị nọ. Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ; ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
ILU 8:4-36 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu unu, madu, ka m'nākpọku; Olum nādaku kwa umu madu. Unu ndi nēnweghi uche, ghọtanu ezi uche; Unu ndi-nzuzu kwa, menu ka obi-unu ghọta ihe. Nurunu, n'ihi na isi ihe di iche iche ka m'nēkwu; Nsaghe eb͕ub͕ere-ọnum gābu kwa ihe di iche iche ziri ezi. N'ihi na ezi-okwu ka okpo-ọnum nēkwu dika onye nātughari uche; Ọzọ, ihe-árú nke eb͕ub͕ere-ọnum ka nmebi-iwu bu. N'ezi omume ka okwu nile nke ọnum di; Ọ dighi ihe nēzighi ezi ma-ọbu ihe b͕agọrọ ab͕agọ di nime ha. Ha nile putara ìhè n'ebe onye-nghọta nọ, Ha zi-kwa-ra ezi n'ebe ndi nāchọta ihe-ọmuma nọ. Nara idọ-aka-na-ntim, anara-kwa-la ọla-ọcha; Nara kwa ihe-ọmuma kari ọla-edo ọma arọputara arọputa. N'ihi na amam-ihe di nma kari ruby; Ihe nile kwa nke nātọ madu utọ, ha agaghi-ara ka ya. Mu onwem, bú amam-ihe, emewo ezi uche ebe-obibim, Ọ bu kwa ọmuma ihe-ìzùzù di iche iche ka m'nāchọputa. Egwu Jehova bu ikpọ ihe ọjọ asì: Npako, na nganga, na uzo ọjọ, Na ọnu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, ka m'kpọworo asì. Mu nwe ndum-ọdu na nzube-ihe: Mu onwem bu nghọta; mu nwe idi-ike. Mu ka ndi-eze ji abu eze, Ọ bu kwa mu ka ndi nāchi achi ji enye ukpuru, bú ezi omume. Mu ka ndi-isi ji abu ndi-isi, Ha na ndi amara aha-ha, bú ndi-ikpe nile nke uwa. Mu onwem nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhum n'anya; Ọ bu kwa ndi nāchọsim ike gāchọtam. Àkù na nsọpuru di n'akam; E, àkù nke nādigide na ezi omume. Nkpurum di nma kari ọla-edo ọma, e, kari ọla-edo anuchara anucha; Ihe-omumem di kwa nma kari ọla-ọcha arọputara arọputa. N'uzọ ezi omume ka m'nēje ije, N'etiti okporo-uzọ nile nke ikpé: Ime ka ndi nāhum n'anya keta ihe di adi, Ka m'we meju kwa ulo-àkù nile ha. Jehova nwerem na nmalite uzọ-Ya, Tutu ọlu-Ya nile site na mb͕e ahu. Site na mb͕e ebighi-ebi ka emerem ka m'guzosie ike, site n'isi-mbu, Tutu uwa adi. Mb͕e ọ dighi ob͕u-miri ọ bula di, amuputaram; Mb͕e ọ dighi isi-iyi ọ bula di nke juputara na miri. Tutu eme ka ntọ-ala ugwu nile bamie n'ala, Tutu ugwu ntà nile adi ka amuputaram: Mb͕e Ọ kēmeghi uwa, ma-ọbu azu obodo, Ma-ọbu nmalite ájá nke elu-uwa dum madu bi. Mb͕e O doziri elu-igwe, n'ebe ahu ka m'nọ: Mb͕e O nyere ukpuru, si, Ka ihe b͕ara buruburu dikwasi n'iru ob͕u-miri: Mb͕e Ọ mere ka mbara-ígwé sie ike n'elu: Mb͕e emere ka isi-iyi nile nke ob͕u-miri di ike: Mb͕e O ji kpara oké osimiri ókè-ya, Ka miri we ghara igabiga okwu-ọnu-Ya: Mb͕e O ji turu ntọ-ala uwa ukpuru: Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile; Nēgwuri egwú n'elu-uwa dum madu bi n'uwa-Ya; Ihe nātọm utọ di kwa n'ebe umu madu nọ. Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu. Nurunu idọ-aka-na-nti, we mara ihe, Unu eze-kwa-la ya ndu. Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu nke nēgem nti bu, N'imu anya n'akuku ibo-ọnu-uzọm nile kwa-ubọchi, Niche nche n'akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọm nile. N'ihi na onye nāchọtam achọtawo ndu, Ọ gēnweputa kwa n'aka Jehova na ihe-ya gātọ Ya utọ. Ma onye nēmehie megidem nēme nkpuru-obi-ya ihe-ike: Ndi nile nke nākpọm asì nāhu ọnwu n'anya.