Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 4:5-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ILU 4:5-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nweta amamihe, nwetakwa nghọta, echezọkwala okwu m, maọbụ site na ya wezuga onwe gị. Ahapụla amamihe, ọ ga-echebe gị, hụ ya nʼanya, nʼihi na ọ ga-eduzi gị. Mmalite amamihe bụ nke a, nweta amamihe, ihe ọbụla o ga-efu gị, nweta nghọta.

ILU 4:5-7 IGBOB (Bible Nso)

Nweta amam-ihe, nweta nghọta; Echezọla, esi-kwa-la n'okwu nile nke ọnum wezuga onwe-gi: Arapula ya, ọ gēdebe kwa gi; Hu ya n'anya, ọ gēchebe kwa gi. Isi ihe ka amam-ihe bu; nweta amam-ihe: E, were ihe nile i nwetaworo nweta nghọta.