ILU 30:17-33 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ILU 30:17-33 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya. “Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ! Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ. “Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’ “Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide, Ohu ghọrọ eze, onye nzuzu ihe na-agara nke ọma, nwanyị obi ilu mesịrị lụta dị, na odibo nwanyị ghọrọ nwunye nna ya ukwu. “Ihe anọ dị nke dị nta nʼelu ụwa, ma ha maa ihe nke ukwuu. Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi. Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume. Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị. Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze. “Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ: Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu, na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu. “Ọ bụrụ na i meela ihe nzuzu site nʼifuli onwe gị elu maọbụ zube nzube ọjọọ, anyala isi nʼihi ya, were aka gị kpuchie ọnụ gị nʼihere. A pịaa mmiri ara ehi a na-ewepụta mmanụ ara ehi; iti mmadụ aka nʼimi na-akpata ịgba ọbara, otu a kwa ikpali iwe na-eweta ise okwu.”
ILU 30:17-33 IGBOB (Bible Nso)
Anya nke nākwa nna-ya emò, Nke nēleda kwa iṅa nne-ya nti, Ugolo-ọma nke ndagwurugwu gāghuputa ya, Umu-ugo gēri kwa ya. Ihe atọ di nke karirim ighọta, E, anọ nke m'nāmagh: Uzọ ugo n'elu-igwe; Uzọ agwọ n'elu oké nkume; Uzọ ub͕ọ n'etiti oké osimiri; Na uzọ nwoke n'ebe nwa-ab͕ọghọ nọ. Otú a ka uzọ nwayi nākwa iko di; O riwo ihe, hicha kwa ọnu-ya, Si, Emeghm ajọ ihe ọ bula. N'okpuru ihe atọ ka uwa maworo jijiji, N'okpuru ihe anọ kwa, nke ọ nāpughi iburu: N'okpuru orù mb͕e ọ nāghọ eze; Na onye-nzuzu mb͕e nri nēju ya afọ; N'okpuru nwayi anākpọ asì mb͕e ọ nwere di; Na nwanyi nēje ozi mb͕e ọ nēketa ihe nwanyi-nwe-ya. Ihe anọ di nke di ntà n'elu-uwa, Ma ihe ahu mara ihe nke-uku: Danda bu ndi nādighi ike, Ma ha nēdozi nri-ha na mb͕e okpom-ọku; Coney bu ndi nēnweghi ume, Ma ha nēdo ulo-ha na nkume di elu; Ọ dighi eze igurube nwere, Ma mb͕e ha nāpu ha nēkè onwe-ha n'usu, ha nile; Nche-ulo nēji aka-ya nile agigado, Ma ihe ahu di n'ulo uku eze. Ihe atọ di nke nāzọ ukwu nke-ọma, E, anọ di nke nēje ije nke-ọma: Ọdum, nke bu dike n'etiti anu nile, Ọ dighi-esi kwa n'iru ihe ọ bula laghachi azu; Inyinya-agha; na nkpi; Na eze, nke nbili megide ya nādighi. Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi, Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ, Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi. N'ihi na opìpì miri-ara-ehi nēweputa miri-ara raru araru, Ọzọ, opìpì imi nēweputa ọbara: Otú a ọpìpì iwe nēweputa ise-okwu.