ILU 27:1-27 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ILU 27:1-27 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyala isi banyere echi, nʼihi na ị maghị ihe echi ga-abụ. Ka onye ọzọ too gị, ọ bụghị ọnụ gị. Ka onye ọzọ too gị, ka egbugbere ọnụ gị abụọ ghara ito gị. Nkume dị arọ, aja bụkwa ibu arọ, ma mkpasu iwe nke onye nzuzu dị arọ karịa ha abụọ. Iwe na-emebi ihe, ma ekworo jọrọ njọ karịa iwe. Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo. Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa. Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu. Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya. Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha. Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya. Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m. Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya. Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe. Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ. Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu. Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ. Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ. Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ. Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ. Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo ma a na-anwale ndị mmadụ site nʼotuto a na-enye ha. Nʼagbanyeghị na ị ga-egwepịa onye nzuzu nʼime ikwe, were aka odo gwee ha dịka mkpụrụ ọka, ị pụghị isite nʼahụ ha wepụ enweghị uche ha. Lezie ọrụ gị anya nke ọma, marakwa ọnọdụ igwe ewu na atụrụ gị na anụ ụlọ ndị ọzọ, nʼihi na akụnụba adịghị adịgide. Ọ bụladị okpueze nke onye eze na-emesịa gabiga. Mgbe e gbupụchara ahịhịa ochie, nke ọhụrụ na-epupụta, mgbe ahụ ka a na-achịkọbata ahịhịa sị nʼugwu. Ụmụ atụrụ ga-enye gị uwe ị ga-eyi, ụmụ ewu ga-enyekwa gị ego ọnụahịa ala ubi gị. Ị ga-enwe mmiri ara ewu nke ga-ezuru gị na ndị ezinaụlọ gị nri, na nke ga-edozi ahụ ndị odibo nwanyị gị.
ILU 27:1-27 IGBOB (Bible Nso)
Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ. Ka onye ala ọzọ to gi, ma ọ bughi ọnu-gi; Ka onye mba ọzọ to gi, ma ekwela ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua to gi. Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua. Ihe nēnweghi obi-ebere ka ọnuma bu, iju-miri ka iwe bu kwa; Ma ònye gēguzo n'iru ekworo? Ọ di nma, bú iba-nba n'ìhè, Kari ihu-n'anya nke ezobeworo ezobe. Ihe kwesiri ntukwasi-obi ka ob͕ub͕u-mma nile nke onye nāhu gi n'anya bu: Ma ihe riri nne ka nsutu-ọnu nke onye nākpọ gi asì bu. Nkupuru-obi nke rijuworo afọ nāzọda manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nābusi: Ma ihe nile ọ bula nke nēlu ilu nātọ nkpuru-obi agu nāgu utọ. Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu, Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu. Manu na ihe-nsure-ọku nke nēsi ísì utọ nēme ka obi ṅuria: Otú a ka utọ eyì madu di nke sitere na ndum-ọdu nke nkpuru-obi. Arapula eyì-gi na eyì nna-gi; Abà-kwa-la n'ulo nwa-nne-gi n'ubọchi nhuju-anya-gi: Ọ di nma, bú ab͕ata-obi nke nọ nso, Kari nwa-nne nke nọ n'ebe di anya. Mara ihe, nwam, we me ka obim ṅuria, Ka m'we zaghachi onye nātam uta okwu. Onye nwere ezi uche ahuwo ihe ọjọ, we zobe onwe-ya: Ma ndi nēnweghi uche agabigawo, ewe rie ha nra. Chiri uwe-ya, bú onye nọworo onye ala ọzọ na mbe; N'ọnọdu nwanyi nābughi nwunye-ya nara ya onwe-ya n'ihe-ibe. Onye ji oké olu agọzi madu-ibe-ya, nke nēbili n'isi-ututu ime ya, Nkọcha ka agāgu ngọzi ahu nye ya. Miri-ọtutu nke nātu mb͕e nile n'ubọchi oké miri-ozuzo, Ya na nwanyi nke nēse okwu yiri: Onye nēzobe ya ezobewo ifufe, Ọ bu kwa manu ka aka-nri-ya nēzute. Ígwè nāmucha ígwè; Otú a ka madu nāmucha iru eyì-ya. Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru. Dika miri si eme ka iru hu iru, Otú a ka obi nēme ka madu hu madu. Afọ adighi-eju ala-mọ na ebe-ila-n'iyì; Otú a afọ adighi-eju anya abua nke madu. Ite eji anucha ihe diri ọla-ọcha, oké ọku di-kwa-ra ọla-edo, Anānwa kwa onye ọ bula site n'otuto-ya. Ọ buru na i ji aka-íkwè supia onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ n'íkwè n'etiti ọka asuru asu, Uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ agaghi-esi n'aru ya wezuga onwe-ya. Mara iru igwè ewu na aturu-gi nke-ọma, Tukwasi obi-gi n'igwè anu-ulo-gi nile: N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile? Ekpopuwo ahihia, ewe hu ahihia ndu, Chikọta kwa ihe-ọkukú nile nke ugwu nile. Umu-aturu diri uwe-oyiyi-gi, Ọnu-ahia nke ọhia-gi ka ewu bu kwa: Ara ewu gēzu-kwa-ra nri-gi, zu-kwa-ra nri ulo-gi; Buru kwa ihe gēdebe umu-ab͕ọghọ-gi ndu.