Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 22:17-18 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ILU 22:17-18 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Lezie anya gee ntị nʼokwu niile nke ndị maara ihe, tinye uche gị nʼihe m na-akụzi. Ọ dị ụtọ ma idebe ha nʼobi gị, ma ha dịkwa nʼegbugbere ọnụ gị mgbe niile.

ILU 22:17-18 IGBOB (Bible Nso)

Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam. N'ihi na ọ di utọ mb͕e i debe ha n'afọ-gi, Mb͕e ha gēguzosi ike n'otù n'elu eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua.