ILU 11:29-31 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ILU 11:29-31 IGBOB (Bible Nso)
Onye nēmekpa èzí-na-ulo-ya aru gēketa ifufe: Orù ka onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya gābu-kwa-ra onye obi-ya mara ihe. Nkpuru onye ezi omume nāmi bu osisi nēnye ndu; Onye nēnwetara Chineke nkpuru-obi madu ka onye mara ihe bu. Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?
Kesaa
ILU 11 IGBOBILU 11:29-31 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye na-ewetara ezinaụlọ ha nsogbu ga-eketa naanị ifufe, onye nzuzu ga-abụ ohu nke onye maara ihe. Mkpụrụ nke ndị ezi omume bụ osisi na-enye ndụ, onye na-erita mkpụrụobi nʼuru bụ onye maara ihe. Ọ bụrụ na a ga-akwụ ndị ezi omume ụgwọ ọrụ ha nʼụwa a; a ga-esi aṅaa ghara ịkwụ ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie ụgwọ ọrụ.
Kesaa
ILU 11 BIU