Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 11:1-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ILU 11:1-4 IGBOB (Bible Nso)

Ihe-osìsì aghughọ bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma nkume-isì-ihe zuru ezu bu ihe nātọ Ya utọ. Nganga bia, nlelì abia kwa: Ma n'ebe ndi di ume-ala n'obi nọ ka amam-ihe di. Izu-okè nke ndi ziri ezi nēdu ha: Ma omume b͕agọrọ nke ndi nāghọb͕u aghọb͕u gēmebi ha. Àkù adighi-aba urù n'ubọchi nke nrubiga-ókè nke iwe: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu.

ILU 11:1-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ihe ọtụtụ aghụghọ bụ arụ nʼihu ONYENWE ANYị ma ihe ọtụtụ zuru ezu na-anata ihuọma nʼebe ọ nọ. Nganga bịa, nlelị a na-eso ya, ma onye dị umeala nʼobi na-amụta ihe. Eziokwu nke ndị ziri ezi nʼobi na-edu ha; ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị aghụghọ nʼala ha nʼiyi. Akụnụba gị agaghị azọpụta gị nʼụbọchị ikpe; ọ bụ naanị ezi omume na-anapụta site nʼọnwụ.