NDI FILIPAI 4:8-13
NDI FILIPAI 4:8-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼikpeazụ, ụmụnna m, na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọbụla mabigara mma oke, ihe ọbụla dị mma na ndụ onye ọbụla nke e kwesiri ịṅomi, na nke e kwesiri inwe otuto nʼihi ya. Na-emenụ ihe ọbụla unu si nʼaka m mụta, maọbụ ihe unu nụrụ, ma ọ bụkwanụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu. Ana m aṅụrị ọṅụ dị ukwuu nʼime Onyenwe anyị nʼihi na unu mechara malite iche echiche ọzọ banyere m. Unu bu m nʼobi nʼeziokwu ma unu enwetaghị ohere izipụta ya. Ọ bụghị na m nọ nʼọnọdụ oke mkpa na ụkọ. Nʼihi na amụtala m otu m ga-esi jiri ọṅụ nọrọ nʼọnọdụ ọbụla. Amụtala m otu m ga-esi nọrọ mgbe ihe siri ike na mgbe ihe bara ụba. Amụtakwala m otu m ga-esi nwee afọ ojuju nʼọnọdụ ọbụla, maọbụ mgbe m na-anọ agụụ, maọbụ mgbe m rijuru afọ, maọbụ mgbe m nwere ihe dị ukwuu maọbụ nʼoge ụkọ. Nʼihi na apụrụ m ime ihe niile site nʼinyeaka onye na-enye m ike.
NDI FILIPAI 4:8-13 Bible Nso (IGBOB)
Nke fọduru, umu-nnam, ka ihe bu ezi-okwu ra, ka ha ra, bú ihe kwesiri nsọpuru, ka ha ra, bú ihe ziri ezi, ka ha ra, bú ihe di ọcha, ka ha ra, bú ihe kwesiri ihu-n'anya, ka ha ra, bú ihe ekwuru nke-ọma; ọ buru na idi-nma ọ bula di, o buru kwa na otuto ọ bula di, nāgukọnu ihe ndia. Ihe unu matara, nke unu nata-kwara, nke unu nu-kwa-ra, nke unu hu-kwa-ra n'arum, nēmenu ihe ndia: Chineke nke udo gānọyere kwa unu. Ma aṅuri rim ọṅu nke-uku nime Onye-nwe-ayi, na ub͕u a n'oge a unu malitere ọhu itukwasi uche n'ihe bayerem; nke unu nātukwasiri uche-unu nime ya n'ezie, ma unu enweghi oghere. Ọ bughi na anamekwu okwu bayere nkpà: n'ihi na mu onwem mutara, n'ọnọdu ọ bula m'nọ, inwezu nime ya ihe nile nākpam nkpà. Amataram uzọ iweda onwem, amata-kwa-ram uzọ ibabiga ókè: n'ihe ọ bula na n'ihe nile ezíwo mu ihe-omimi a, bú inọ n'afọ-ojuju na inọ kwa n'agu, ibabiga ókè na inọ kwa na nkpà. Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.