NDI FILIPAI 4:14-16
NDI FILIPAI 4:14-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma unu mere nnọọ nke ọma inyere m aka nʼọnọdụ nsogbu nke m nọ nʼime ya. Unu onwe unu ndị Filipai maara na mbido nke oziọma a, mgbe m hapụrụ Masidonia, na o nweghị nzukọ ọzọ nyere m aka nʼinye maọbụ ịnabata onyinye, ma e wezuga unu. Ọ bụladị mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m onyinye ihe karịrị otu ugbo, inyere m aka na mkpa m.
Kesaa
Gụọ NDI FILIPAI 4NDI FILIPAI 4:14-16 Bible Nso (IGBOB)
Otú ọ di, unu mere nke-ọma, n'isom nwekọ nkpab͕um. Ma unu onwe-unu makwara, ndi Filipai, na nime nmalite nke ozi ọma, mb͕e m'siri na Masedọnia puta, ọ dighi nzukọ Kraist ọ bula nke mu na ya nwekọrọ ihe n'okwu bayere onyinye na ọnina, ma-ọbughi nání unu onwe-unu; n'ihi na ọbuná na Tesalọnaika unu zigara otù mb͕e ziga kwa mb͕e ọzọ ib͕om nkpà.
Kesaa
Gụọ NDI FILIPAI 4