NDI FILIPAI 3:12-16
NDI FILIPAI 3:12-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Anaghị m ekwu na m etozuola oke, maọbụ nwezuo ihe niile. Ma a na m agbalịsi ike ka m jide ihe ahụ nke Kraịst Jisọs jidere m nʼihi ya. Ụmụnna m, nʼezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesiri ịbụ. Ma ihe m ji ike m niile na-eme bụ ichefu ihe niile ndị gara aga, na ilekwasị anya nʼihe ahụ m na-agbaso bụ nke dị m nʼihu. Ana m agbasi ọsọ ike iji gbaruo nʼisi, maka irite ihe ahụ a na-agbata nʼọsọ, bụ ọkpụkpọ ịbanye na ndụ eluigwe ahụ nke Chineke kpọrọ m site na Jisọs Kraịst. Ka anyị niile, bụ ndị tozuru oke nʼime mmụọ nwee uche dị otu a. Ọ bụrụkwa na ụfọdụ nʼime unu nwere uche ọzọ dị iche, Chineke ga-ekpughere unu nke a. Ka anyị jidesienụ aka ike naanị nʼihe ahụ anyị nweterela.
NDI FILIPAI 3:12-16 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya. Umu-nnam, mu onwem agughi onwem na ejidewom rue ub͕u a: ma otù ihe ka m'nēme, ebe m'nēchezọ ihe nile di n'azu, nēsetipu kwa aka n'ebe ihe nile di n'iru di, anamab͕akuru ókè ib͕a-ọsọ ka m'we nata ihe anāb͕ata n'ọsọ nke ọkpukpọ di elu nke Chineke nime Kraist Jisus. Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n'ihe ọ bula n'uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu: náni nka, n'ihe ahu ayi b͕aruru, ka ayi nāgazi dika ihe ahu si di.